LEGỌS: Otu Gọọmenti, OPC, Ndị Ọzọ Si Na-Akwado Mmegide Ụmụ Igbo Na-azụ Ahia N'ahia Alaba

Ụnyahụ ka ụmụ Igbo na-azụ ahịa n’ahịa Alaba dị na Legọs, kpọkuru onye isi uwe ojii na Naijiria bụ Idris, ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka. Nke a bụ maka na ndị alaye, ndị OPC na ndị ọrụ gọọmenti si na ngalaba n’ahụ maka ala, bịara kulisịba ụlọ ahịa ha na ihe ndị ọzọ n’ebe ahụ.

Ha gotere ala ruru plọọtụ iri anọ na asatọ (48) kemgbe afọ 2008. Ha goro ala ahụ n’aka ndị nwe ya bụ Omo Eleduwa nke ezinụlọ Kemberi na Adetona, mgbe ha gopuru ya bụ ala, akwụkwọ ya nile zuru oke. Ha zụrụ ya maka iji were na akwaba ngwa ahịa, na ọnọdụ ebe ha na-anọ akwaghasị ahịa ha batara ọhụrụ. Ọchịchị gbara ebe nile, mgbe otu onye nke si na ọ bụ “Almoston Naijiria Ltd” nke onyeisi ya bụ Akande, senitere isi ya, kwuo na ala ahụ bụ nke ya, na gọọmenti steeti Legos nyere ya akwụkwọ ikikere iwere ya bụ ala(C of O). Nke a bụ n’afọ 2010.

N’ọnwa Nọvemba afọ 2015, o kpụpụrụ ndị ahịa ahụ ụlọ ikpe, na-ekwu na ndị ahịa nọ n’ala ya. Mana ka ọnwa Jun gbara ụbọchị iri na ato n’afọ 2016, onye ọka ikpe na-ahụ maka ya bụ okwu, kwuru na ndị ahịa ga-aka na-azụ ahịa ebe ahụ na-enweghị ihe ọbụla e mere ha, ganye na-ekpesịa ya bụ ikpe.

Na-agbanyeghi ihe iwu kwuru, ndị ụlọ ọrụ nke Almoston, site na nkwado nke gọọmenti Legos, bidoro kutusiba ihe nile ha nwere na ya bụ ahịa. Nke a bụ nnukwu nnupu isi nyere iwu obodo nke gọọmenti ji aghụghọ akwado.

Onyeisi ndị uwe ojii, enyela osote onyeisi ndị uwe ojii na Legos iwu ka o nyocha ihe na-eme na ya bụ ahịa, ma hụ na akwafughi ọbara ọbụla n’ebe ahụ.

Ụdị ego gọọmenti Legos ii ndị Igbo akpa, adịghị okwukwu. Ha chọọ ka a gbọọrọ ha nnukwu ego, ha enye ndị ahịa ndị Igbo nọ ebe ahụ nnukwu nsogbu, ha anyụọrọ ha ego. Ọ bụghị ihe taata.

- Odeniigbo

Oriental Times

5/1/2017

 

LEGỌS: Otu Gọọmenti, OPC, Ndị Ọzọ Si Na-Akwado Mmegide Ụmụ Igbo Na-azụ Ahia N'ahia Alaba

market in Lagos
 
 
 
Amnesty International’s
report on Biafra killings
Amnesty International
Amnesty’s 60-page PDF format
report on IPOB/Biafra killings
More>>>>
 
 

Biafra Enters into
GUINNESS WORLD RECORD
Bifra Breakes World Record

 
 
 
Tension in Nigeria's Seat of Power as Irish Govt Returns A 122yr-old Map Of Ancient Biafran Empire
Irish Govt Returns A 122yr-old Map Of Ancient Biafran Empire
The Irish Ambassador to Nigeria, Sean Hoy, Saturday 11, made a presentation of three route maps of Calabar and other Niger Delta terrains in the defunct Biafra to the Director General of theme National Commission for Museums and Monuments
More>>>>
 
 
 
Ancient Biafra Map Small
 
 
 
Comparing Singapore as a Lesson for Biafra
singapore
Don't get me wrong, Singapore is a nice country to be compared with Biafra. If one day Biafra becomes like Singapore I will be very glad indeed.
More>>>>
 
 
 
I Will Do My Best to Help Biafra ---Pope Francis
Pope Frances greets Biafran protesters
For the first time in history a major world leader Pope Frances greeted the Biafran protesters.
More>>>>
 
 
 
Biafra is my country
Child of Biafra
More>>>>
 
 
 
Biafrans Match On
Biafrans Demonstrate6
More>>>>
 
 
 
Biafra Charter
Biafran Flag3
More>>>>
 
 
 
Biafrans Protesting
Biafrans Demonstrate2
More>>>>
 
 
 
Indigenous People of Biafra
and Radio Biafra
Biafra Radio3
More>>>>
 
 
 
Biafra is not Igbo and
Igbo is not Biafra
Map of Biafra-s
Many have been misled to believe that the defunct Republic of Biafra was another name for the Igbo ethnic group in Nigeria. This notion is totally untrue. The defunct Republic of Biafra was the name for the entire eastern region of Nigeria as at May 30, 1967, which comprised of 8 provinces namely
More>>>>
 
 
 
Meaning of Igbo in Nigeria’s Geopolitics
Meaning of Igbo in Nigeria’s geopolitics
Depending on where one is standing, in Nigeria, the name Igbo is a compound word that includes many ethnic groups heaped together.
More>>>>
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 

 

 

 

Home     News     Newspapers     Ohanaeze     The Biafran War     Photos     Videos     Igbo Books   
Igbo Cartoons     Igbo Events     Igbo Foods     Igbo Language     Igbo Music

copyright © 2016 Igbo Focus   Email: Igbofocus@msn.com  website: www.igbofocus.co.uk

 

Home     News     Newspapers     Ohanaeze     The Biafran War     Photos     Videos     Igbo Books   

Igbo Cartoons     Igbo Events     Igbo Foods    Igbo Language     Igbo Music

Igbo Focus